MPỤTARA AHA OTUTU ỤMỤ NWOKE NA NSIRIHỤ NDỊ IGBO N’USORO AMỤMAMỤ ASỤSỤ NCHEKE

Authors

  • Florence Uju Ibeh, Ph.D. Department of Igbo, African and Communication Studies, Nnamdi Azikiwe University, Awka Nigeria. P.M.B 5025

Abstract

Nchọcha a na-atụle mpụtara aha otutu ụmụ nwoke na nsirihụ ndị Igbo n’usoro amụmamụ asụsụ ncheke. Asụsụ ncheke bụ amụmamụ e kepụtara ọhụrụ ji nghota amụ asụsụ Aha otutu n’aka nke ọzọ pụtara aha mmadụ riiri onwe ya site n’echichi maọbụ nke ndị nwe mmadụ rinyere ya dị ka ha siri hụta onye ahụ. Ụfọdụ ebumnobi nchọcha a bụ ịnye nkọwa aha otutu, ịchọpụta ụdị aha otutu ụmụ nwoke dị iche iche, echiche dị n’aha otutu ndị ahụ na otu ha siri nweta maọbụ rie aha otutu ahụ. Nchọcha a bụ nke a gbasoro usoro nnyocha mee n’okpuru ọchịchị Idemili nọt na saụt dị na Steeti Anambara. A gbara ụfọdụ ndị mmadụ ajụjụ ọnụ ma tulekwa ihe ndị e dere n’ụdị isi okwu a maka nkwado ihe a na-ede. Atụtụ nchọcha bụ atụtụ ndịna ncheke nke Lakoff na Johnson (1980) na atụtụ Njirimee nke Wittgenstein (1953). Ụfọdụ ihe a chọpụtara na ngwụcha ihe ọmụmụ a bụ na aha otutu ụmụ nwoke na-aza dị ọtụtụ, ụfọdụ aha ka ha riiri maọbụ zaara onwe ha site n’echichi, ụfọdụ bụrụ nke ndị nwe onye ahụ riwere ya dị ka ndụ ya siri dị. Ọzọ bụ na aha otutu ndị a niile na-enwe echiche na nghọta so ya. A chọpụtakwara na aha otutu na-enye aka ịchịkwa akparamagwa mmadụ tụmadụ ndị e riri site ka ndụ onye ahụ na-ebi siri dị.Nchọcha a na-atụ arọ ka ụmụ nwoke ruru ihe e ji mmadụ eme gaa n’ihu na-aza aha otutu dị mma maka nchekwe akparamagwa dị na ya.

Downloads

Published

2025-10-09 — Updated on 2025-10-09